52 Chụpụnụ ndị niile bi n’ala ahụ n’ihu unu ma bibie ihe oyiyi niile ha ji nkume mee,+ bibiekwanụ ihe oyiyi niile ha ji ígwè wụọ,+ laakwanụ ebe nsọ ha niile dị elu n’iyi.+
2 Unu ga-ebibicha+ ebe niile mba ndị unu na-anapụ ala ha na-anọ efe chi ha, ya bụ, n’ugwu dị elu na n’obere ugwu dị iche iche nakwa n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ.+