4 Ndị isi ndị Filistia wee weso ya iwe; ndị isi ndị Filistia wee sị ya: “Gwa nwoke a laghachi,+ ka ọ laghachi n’ebe i nyere ya; ekwela ka o soro anyị jee agha, ka ọ ghara iguzogide+ anyị n’agha ahụ. Gịnị ka onye a ga-eji mee ka ya na onyenwe ya dị ná mma? Ọ́ bụghị isi ndị ikom anyị?