2 Ihe E Mere 23:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 23 N’afọ nke asaa, Jehoyada+ nwere obi ike wee kpọrọ ndị isi nke otu narị otu narị ndị agha,+ ya bụ, Azaraya nwa Jeroham na Ishmel nwa Jehohenan na Azaraya nwa Obed na Measaya nwa Adaya na Elishefat nwa Zikraị, ya na ha wee gbaa ndụ. Ilu 10:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Ncheta a na-echeta onye ezi omume ga-ewetara ya ngọzi,+ ma aha ndị ajọ omume ga-ere ure.+ Ndị Hibru 6:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 N’ihi na Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya,+ ebe unu jewooro ndị nsọ ozi+ ma ka na-eje ozi.
23 N’afọ nke asaa, Jehoyada+ nwere obi ike wee kpọrọ ndị isi nke otu narị otu narị ndị agha,+ ya bụ, Azaraya nwa Jeroham na Ishmel nwa Jehohenan na Azaraya nwa Obed na Measaya nwa Adaya na Elishefat nwa Zikraị, ya na ha wee gbaa ndụ.
10 N’ihi na Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya,+ ebe unu jewooro ndị nsọ ozi+ ma ka na-eje ozi.