8 Ozugbo Esa nụrụ okwu ndị a na amụma Oded+ onye amụma buru, obi siri ya ike, o wee wepụsịa ihe arụ+ n’ala niile nke Juda na Benjamin nakwa n’obodo ndị o weghaara n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu,+ ọ rụzikwara ebe ịchụàjà Jehova nke dị n’ihu ihe owuwu ụzọ mbata nke ụlọ Jehova.+