5 Otú e si kwee efọd ahụ ka e si kwee eriri ya nke dị n’elu ya iji na-ekesi ya ike, e jikwa otu ihe ahụ e ji kwee efọd ahụ, bụ́ eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie na ezigbo eri linin a kpara akpa, kwee ya,+ dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.