73 Ndị nchụàjà+ na ndị Livaị na ndị nche ọnụ ụzọ ámá na ndị na-abụ abụ+ na ụfọdụ n’ime ndị anyị nakwa ndị Netinim+ na Izrel dum wee biri n’obodo ha.+ N’ọnwa nke asaa,+ ụmụ Izrel nọcha n’obodo ha dị iche iche.+
3 Ndị a bụ ndị isi ógbè ahụ a na-achị achị,+ bụ́ ndị bi na Jeruselem;+ ma n’obodo ndị dị na Juda, onye ọ bụla n’ime ndị Izrel,+ ndị nchụàjà+ na ndị Livaị,+ na ndị Netinim+ na ụmụ ndị ohu Sọlọmọn+ bi n’ala ya, n’obodo ha.+