Nehemaya
11 Ndị isi+ ụmụ Izrel wee biri na Jeruselem;+ ma ndị ọzọ fere nza+ ịkpọta otu onye n’ime mmadụ iri ọ bụla ka o biri na Jeruselem bụ́ obodo nsọ,+ mmadụ itoolu fọdụrụnụ ebirikwa n’obodo ndị ọzọ. 2 Ụmụ Izrel gọzikwara+ ndị ahụ niile wepụtara onwe ha+ ibi na Jeruselem.
3 Ndị a bụ ndị isi ógbè ahụ a na-achị achị,+ bụ́ ndị bi na Jeruselem;+ ma n’obodo ndị dị na Juda, onye ọ bụla n’ime ndị Izrel,+ ndị nchụàjà+ na ndị Livaị,+ na ndị Netinim+ na ụmụ ndị ohu Sọlọmọn+ bi n’ala ya, n’obodo ha.+
4 Ụfọdụ n’ime ụmụ Juda na ụfọdụ n’ime ụmụ Benjamin+ bikwa na Jeruselem. Ndị bụ́ ụmụ Juda bụ Ataya nwa Ọzaya nwa Zekaraya nwa Amaraya nwa Shefataya nwa Mahalalel nwa Pirez;+ 5 Measaya nwa Barọk nwa Kọlhoze nwa Hazaya nwa Adaya nwa Joyarib nwa Zekaraya nwoke si n’agbụrụ Shila. 6 Ụmụ Pirez niile ndị bi na Jeruselem dị narị anọ na iri isii na asatọ, ndị ikom ruru eru.
7 Ndị a bụ ụmụ Benjamin:+ Salu nwa Meshọlam+ nwa Joed nwa Pedaya nwa Kolaya nwa Measaya nwa Itiel nwa Jesheya; 8 ndị na-eso ya bụ Gabaị na Salaị, narị itoolu na iri abụọ na asatọ; 9 Joel nwa Zikraị, onye na-elekọta ha, na Juda nwa Hasenua bụ́ onye na-elekọta obodo ahụ dị ka onye na-esote ya.
10 Ndị a bụ ndị nchụàjà: Jedeya nwa Joyarib,+ Jekin,+ 11 Seraya nwa Hilkaya nwa Meshọlam+ nwa Zedọk+ nwa Mereyọt nwa Ahaịtọb,+ onye ndú nke ụlọ ezi Chineke; 12 ụmụnne ha ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ahụ+ dị narị asatọ na iri abụọ na abụọ; Adaya nwa Jeroham+ nwa Pelalaya nwa Amzaị nwa Zekaraya nwa Pash-họ+ nwa Malkaịja,+ 13 na ụmụnne ya, ndị isi nke ọnụmara+ dị iche iche dị narị abụọ na iri anọ na abụọ, Amashsaị nwa Azarel nwa Azaị nwa Meshilemọt nwa Ịma, 14 na ụmụnne ha, ndị dike nwere ume,+ otu narị na iri abụọ na asatọ, e nwekwara onye na-elekọta+ ha, bụ́ Zabdiel nwa ndị ukwu.
15 Ndị a bụ ndị Livaị:+ Shemaya nwa Hashọb nwa Azraịkam nwa Hashabaya+ nwa Bọnaị, 16 na Shabetaị+ na Jozabad,+ bụ́ ndị so ná ndị isi ndị Livaị, ndị na-elekọta ọrụ a na-arụ n’èzí ụlọ ezi Chineke; 17 ọ bụ Matanaya+ nwa Maịka nwa Zabdaị nwa Esaf,+ onye nduzi abụ otuto,+ ji ekpere na-enye otuto,+ Bakbọkaya bụkwa onye nke abụọ n’ime ụmụnne ya, tinyere Abda nwa Shamua nwa Gelal+ nwa Jedutọn.+ 18 Ndị Livaị niile ndị nọ n’obodo nsọ+ dị narị abụọ na iri asatọ na anọ.
19 Ndị nche ọnụ ụzọ ámá+ bụ Akọb, Talmọn+ na ụmụnne ha, bụ́ ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá,+ otu narị na iri asaa na abụọ.
20 Ndị Izrel ndị ọzọ, na ndị nchụàjà na ndị Livaị ndị ọzọ, bi n’obodo ndị ọzọ niile dị na Juda, onye nke ọ bụla n’ihe nketa+ nke ya. 21 Ndị Netinim+ bi n’Ofel;+ Zaịha na Gishpa na-elekọta ndị Netinim.
22 Onye na-elekọta+ ndị Livaị ndị bi na Jeruselem bụ Ọzaị nwa Benaị nwa Hashabaya nwa Matanaya+ nwa Maịka+ nwa Esaf,+ bụ́ ndị na-abụ abụ,+ n’ọrụ a na-arụ n’ụlọ ezi Chineke. 23 N’ihi na o nwere ihe eze nyere n’iwu maka ha,+ e mekwara ndokwa maka ihe oriri ndị na-abụ abụ ga na-eri, ihe ga-ezuru ha n’ụbọchị.+ 24 Petahaya nwa Meshezabel nwa Zira nwa Juda na-anọ n’akụkụ eze maka okwu ọ bụla metụtara ndị anyị.
25 N’ihe banyere ógbè+ niile na ala ndị dị na ha, e nwere ụfọdụ n’ime ụmụ Juda bi na Kiriat-aba+ na obodo nta ya niile nakwa na Daịbọn na obodo nta ya niile nakwa na Jekabziel+ na ógbè ya niile, 26 nakwa na Jeshụa nakwa na Moleda+ nakwa na Bet-pelet+ 27 nakwa na Heza-shual+ nakwa na Bia-shiba+ na obodo nta ya niile 28 nakwa na Ziklag+ nakwa na Mekona na obodo nta ya niile 29 nakwa n’En-rimọn+ nakwa na Zora+ nakwa na Jamọt,+ 30 Zanoa,+ Adọlam+ na ógbè ha niile, Lekish+ na ala ya, Azika+ na obodo nta ya niile. Ha wee maa ụlọikwuu ha malite na Bia-shiba ruo nnọọ na ndagwurugwu Hinọm.+
31 Ụmụ Benjamin si Giba,+ Mikmash+ na Aịja+ na Betel+ na obodo nta ya niile, 32 Anatọt,+ Nọb,+ Ananaya, 33 Hezọ, Rema,+ Giteyịm,+ 34 Hedid, Zeboyim, Nebalat, 35 Lọd+ na Ono,+ ndagwurugwu ndị omenkà. 36 Ụfọdụ n’ime ndị Livaị ndị bibu n’ala Juda bịara biri n’ala Benjamin.