32Ma ụmụ Izrel hụrụ na Mozis na-egbu oge nke ukwuu ịrịdata n’ugwu ahụ.+ Ha wee gbakọọ n’ebe Erọn nọ wee sị ya: “Bilie, meere anyị chi nke ga na-ebutere anyị ụzọ,+ n’ihi na Mozis a, bụ́ onye dupụtara anyị n’ala Ijipt,+ anyị amaghị ihe mere ya.”
12 Jehova wee sị m, ‘Bilie, si n’ebe a gbadaa ọsọ ọsọ, n’ihi na ndị gị bụ́ ndị ị kpọpụtara n’Ijipt emewo omume na-eweta mbibi.+ Ha emewo ngwa ngwa hapụ ụzọ m nyere ha iwu ka ha soro. Ha emeworo onwe ha ihe oyiyi a wụrụ awụ.’+