15 “Ihe niile nke meghere akpa nwa,+ nke ụdị anụ ahụ́ ọ bụla, ma mmadụ ma anụmanụ, nke ha ga-ewetara Jehova, ga-aghọ nke gị. Otú ọ dị, ị ghaghị ịgbara nwa mbụ mmadụ mụrụ agbara;+ ị ga-agbarakwa nwa mbụ anụmanụ na-adịghị ọcha mụrụ.+
6 Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka unu ga-eweta àjà nsure ọkụ+ unu na àjà nkịtị unu na otu ụzọ n’ụzọ iri+ unu na onyinye unu na-eweta+ na onyinye unu kwere ná nkwa+ na onyinye afọ ofufo+ unu na anụ ndị e bu ụzọ mụọ n’ìgwè ehi unu nakwa n’ìgwè ewu na atụrụ+ unu.