9 Nwa agbọghọ ahụ dị mma n’anya ya, nke mere na o nwetara obiọma+ ya, o mekwara ngwa wee nye ya ihe a na-eji ahịa ya aka n’ahụ́+ ma na-enye ya nri pụrụ iche, sikwa n’ụlọ eze kpọnye ya ụmụ agbọghọ asaa a họrọ ahọ, wee kpọfee ya na ụmụ agbọghọ ya n’ebe kasị mma n’ụlọ ndị inyom.