Diuterọnọmi 12:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 Unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu,+ unu na ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom na ohu unu ndị ikom na ohu unu ndị inyom na onye Livaị nke bi n’obodo unu, n’ihi na ọ dịghị òkè ma ọ bụ ihe nketa o nwere n’etiti unu.+ Abụ Ọma 32:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Ṅụrịanụ ọṅụ n’ime Jehova, nweekwanụ obi ụtọ, unu ndị ezi omume;+Tienụ mkpu ọṅụ, unu niile ndị obi ha ziri ezi.+ Abụ Ọma 33:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 33 Unu ndị ezi omume, tienụ mkpu ọṅụ n’ihi Jehova.+Ndị ziri ezi kwesịrị inye ya otuto.+ Ndị Filipaị 4:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile n’ime Onyenwe anyị.+ Aga m asị ọzọ, Na-aṅụrịnụ ọṅụ!+
12 Unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu,+ unu na ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom na ohu unu ndị ikom na ohu unu ndị inyom na onye Livaị nke bi n’obodo unu, n’ihi na ọ dịghị òkè ma ọ bụ ihe nketa o nwere n’etiti unu.+
11 Ṅụrịanụ ọṅụ n’ime Jehova, nweekwanụ obi ụtọ, unu ndị ezi omume;+Tienụ mkpu ọṅụ, unu niile ndị obi ha ziri ezi.+