18 Ugwu Saịnaị dum wee na-akwụ anwụrụ ọkụ,+ n’ihi na Jehova ji ọkụ gbadata na ya;+ anwụrụ ọkụ si na ya wee na-akwụgo dị ka anwụrụ ọkụ si n’ekwú ọkụ,+ ugwu ahụ dum nọkwa na-ama jijiji nke ukwuu.+
24 Unu wee sị, ‘Lee, Jehova bụ́ Chineke anyị egosiwo anyị ebube ya na ịdị ukwuu ya, anyị anụwokwa olu ya n’etiti ọkụ.+ Anyị ahụwo taa na Chineke nwere ike ịgwa mmadụ okwu, onye ahụ aka dị ndụ.+