Ọpụpụ 19:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 O wee ruo n’ụbọchị nke atọ, mgbe chi bọrọ, na égbè eluigwe malitere ịgba, àmụ̀mà malitekwara igbu,+ ígwé ojii kpuchikwara elu ugwu ahụ,+ opi dasikwara ụda ike,+ nke mere na ụmụ Izrel niile ndị nọ n’ebe ha mara ụlọikwuu malitere ịma jijiji.+ Ọpụpụ 19:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 Mgbe ụda opi ahụ nọ na-adasikwu ike, Mozis malitere ikwu okwu, ezi Chineke wee malite iji oké olu na-aza ya.+ Ndị Hibru 12:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 na ụda opi+ na olu okwu;+ nke bụ́ olu ndị Izrel nụrụ wee rịọ ka a ghara ịgwa ha okwu ọ bụla ọzọ.+
16 O wee ruo n’ụbọchị nke atọ, mgbe chi bọrọ, na égbè eluigwe malitere ịgba, àmụ̀mà malitekwara igbu,+ ígwé ojii kpuchikwara elu ugwu ahụ,+ opi dasikwara ụda ike,+ nke mere na ụmụ Izrel niile ndị nọ n’ebe ha mara ụlọikwuu malitere ịma jijiji.+
19 Mgbe ụda opi ahụ nọ na-adasikwu ike, Mozis malitere ikwu okwu, ezi Chineke wee malite iji oké olu na-aza ya.+