Job 14:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Ma dimkpa na-anwụ wee tọgbọrọ dị ka onye e meriri emeri;Mmadụ na-ekubi ume, ma olee ebe ọ nọ?+ Abụ Ọma 78:39 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 39 Ọ nọgidere na-echeta na ha bụ anụ ahụ́,+Na mmụọ ha na-apụ apụ, ọ dịghịkwa alọghachite.+ Luk 12:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 Ma Chineke sịrị ya: ‘Onye na-enweghị uche, n’abalị a ka a na-achọ mkpụrụ obi gị n’aka gị.+ Ònye ga-enwezi ihe ndị ị kwakọbara?’+ Jems 4:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 ma unu amaghị ihe ndụ unu ga-abụ echi.+ N’ihi na unu bụ alụlụụ nke na-apụta ruo nwa oge wee pụọ n’anya.+
20 Ma Chineke sịrị ya: ‘Onye na-enweghị uche, n’abalị a ka a na-achọ mkpụrụ obi gị n’aka gị.+ Ònye ga-enwezi ihe ndị ị kwakọbara?’+
14 ma unu amaghị ihe ndụ unu ga-abụ echi.+ N’ihi na unu bụ alụlụụ nke na-apụta ruo nwa oge wee pụọ n’anya.+