12 Unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu,+ unu na ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom na ohu unu ndị ikom na ohu unu ndị inyom na onye Livaị nke bi n’obodo unu, n’ihi na ọ dịghị òkè ma ọ bụ ihe nketa o nwere n’etiti unu.+
10 O wee gaa n’ihu ịsị ha: “Laanụ, rienụ ihe mara abụba, ṅụọkwanụ ihe na-atọ ụtọ, zigakwaranụ+ onye ọ na-enweghị ihe a kwadebeere ya ihe; n’ihi na taa dị nsọ n’ebe Onyenwe anyị nọ, unu enwekwala mwute, n’ihi na ọṅụ Jehova bụ ebe unu e wusiri ike.”