5 O wee gwa Kora na ndị niile ya na ha zukọtara, sị: “N’ụtụtụ, Jehova ga-eme ka a mara onye bụ́ nke ya+ na onye dị nsọ+ na onye ga na-abịa ya nso,+ onye ọ bụla ọ họọrọ+ ga na-abịa ya nso.
12 “Ọ ga-erukwa na, n’ihi na unu na-ege ntị ná mkpebi ikpe ndị a, na-edebekwa ha ma na-eme ha,+ Jehova bụ́ Chineke gị ga-edebere gị ọgbụgba ndụ+ na obiọma, bụ́ ndị ọ ṅụụrụ nna nna gị hà n’iyi.+