18 Lee! Ihe kasị mma mụ onwe m hụworo, nke bụ́ ihe mara mma, bụ ka mmadụ rie ihe, ṅụọ ihe ọṅụṅụ ma hụ ihe ọma n’ihi ọrụ niile ọ gbalịsiri ike+ na-arụ n’okpuru anyanwụ n’ụbọchị niile nke ndụ ya nke ezi Chineke nyere ya, n’ihi na nke ahụ bụ òkè ya.
22 Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie ya; ha agaghị akụ mkpụrụ, onye ọzọ erie ya. N’ihi na dị ka osisi si anọ ogologo ndụ, otú ahụ ka ndị m ga-anọ ogologo ndụ;+ ndị m họọrọ ga-eji ihe aka ha rụpụtara mee ihe n’uju.+