18 N’ihi ya, Chineke mere ka ndị Izrel gaa gburugburu n’ụzọ ala ịkpa nke Oké Osimiri Uhie.+ Ma a haziri ụmụ Izrel n’usoro dị ka ndị agha mgbe ha si n’ala Ijipt na-apụ.+
22 E mesịa, Mozis mere ka Izrel si n’Oké Osimiri Uhie pụọ, ha wee banye n’ala ịkpa Shọọ+ ma gaa ije n’ala ịkpa ahụ ruo ụbọchị atọ, ma ha ahụghị mmiri.+
2 Cheta ụzọ niile Jehova bụ́ Chineke gị mere ka i jegharịa n’ala ịkpa n’ime afọ iri anọ ndị a,+ iji mee ka ị dị umeala,+ iji lee gị ule+ ka ọ mara ihe dị gị n’obi,+ iji mara ma ị̀ ga-edebe ihe o nyere n’iwu ma ọ bụ na ị gaghị edebe.
15 onye mere ka i jiri ụkwụ gafee nnukwu ala ịkpa nke dị egwu,+ ebe e nwere agwọ ọjọọ+ nakwa akpị, ebe bụkwa ala kpọrọ nkụ nke mmiri na-adịghị; onye mere ka mmiri si n’oké nkume siri ike gbapụtara gị;+