7 Ihe isi ike dakwasịrị ya,+ o kwekwara ka e mekpaa ya ahụ́;+ ma o mepeghị ọnụ ya. A kpụụrụ ya dị ka atụrụ a gaje igbu egbu;+ dịkwa ka nne atụrụ nke dara ogbi n’ihu ndị na-akpacha ya ajị, otú ahụkwa ka ọ na-emepeghị ọnụ ya.+
25 Ya mere, ndị ọzọ bụ́ ndị na-eso ụzọ Jizọs sịrị ya: “Anyị hụrụ Onyenwe anyị!” Ma ọ sịrị ha: “Ọ bụrụ na mụ ahụghị apa ntu n’aka ya, rụnyekwa mkpịsị aka m n’apa ntu ndị ahụ, rụnyekwa aka m n’akụkụ ya,+ agaghị m ekweta ma ọlị.”+