Ilu 4:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 N’ihi na ha adịghị arahụ ụra ọ gwụla ma hà mere ihe ọjọọ,+ ụra adịghịkwa atụ ha ọ gwụla ma hà mere ka mmadụ sụọ ngọngọ.+ Ilu 4:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 N’ihi na ha eriwo nri ajọ omume,+ ọ bụkwa mmanya ime ihe ike ka ha na-aṅụ.+ Hosia 4:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Mmehie ndị m ka ha na-eripịa, njehie ha na-agụsikwa mkpụrụ obi ha ike.+
16 N’ihi na ha adịghị arahụ ụra ọ gwụla ma hà mere ihe ọjọọ,+ ụra adịghịkwa atụ ha ọ gwụla ma hà mere ka mmadụ sụọ ngọngọ.+