39 Pita wee bilie soro ha gaa. Mgbe ọ bịarutekwara, ha duuru ya gaa n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu; ndị inyom niile di ha nwụrụ pụtara n’ihu ya na-akwa ákwá ma na-egosi ya ọtụtụ uwe ime na uwe elu+ ndị Dọkas na-akwa mgbe ya na ha nọ.+
2 ka unu wee nabata+ ya n’ime Onyenwe anyị dị ka e kwesịrị ịnabata ndị nsọ, ka unu wee nyekwara ya aka n’ihe ọ bụla enyemaka unu pụrụ ịdị ya mkpa,+ n’ihi na ya onwe ya bụ onye na-agbachitere ọtụtụ ndị, ee, onye na-agbachitere mụ onwe m.