1 Ndị Eze 1:48 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 48 Nke a bụkwa ihe eze kwuru, ‘Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel bụrụ onye a gọziri agọzi,+ bụ́ onye mere ka e nwee onye ga-anọkwasị n’ocheeze m taa, m wee jiri anya m hụ ya!’”+ Ilu 23:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Nwa m, ọ bụrụ na obi gị amara ihe,+ obi m ga-aṅụrị ọṅụ, ee, obi nke m.+ Ilu 27:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa,+ ka m wee zaa onye na-akwa m emo okwu.+
48 Nke a bụkwa ihe eze kwuru, ‘Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel bụrụ onye a gọziri agọzi,+ bụ́ onye mere ka e nwee onye ga-anọkwasị n’ocheeze m taa, m wee jiri anya m hụ ya!’”+