18 Ma mba niile were iwe, iwe gị wee bịa, na oge a kara aka maka ikpe ndị nwụrụ anwụ ikpe, na inye ndị ohu gị bụ́ ndị amụma+ na ndị nsọ na ndị na-atụ egwu aha gị, ndị nta na ndị ukwu,+ ụgwọ ọrụ ha,+ na ibibi+ ndị na-ebibi ụwa.”+
3 Ọ tụbakwara ya n’ime abis+ ahụ, mechie ya ma kaa ya akara mgbe ọ tụbasịrị ya, ka o wee ghara iduhie mba niile ọzọ ruo mgbe otu puku afọ ahụ gwụsịrị. Mgbe ihe ndị a gasịrị, a ga-atọpụ ya ruo nwa oge.+