45 ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe,+ n’ihi na ọ na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.+
17 ọ bụ ezie na ọ hapụghị onwe ya n’enweghị ihe àmà, ebe o mere ihe ọma,+ na-enye unu mmiri ozuzo+ site n’eluigwe, na oge mkpụrụ ji amị, na-enyekwa unu nri n’ụba, na-emekwa ka unu nwee obi ụtọ.”+