24 Ma, ha ekwughị n’obi ha, sị: “Ka anyị tụọ egwu Jehova bụ́ Chineke anyị,+ Onye na-eme ka e nwee nnukwu mmiri ozuzo na ụbịa mmiri na ụla mmiri n’oge ha,+ Onye na-echekwara anyị izu a kara aka maka owuwe ihe ubi anyị.”+
45 ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe,+ n’ihi na ọ na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.+