22 N’oge ahụkwa, m gwara ndị ọrụ ahụ, sị: “Ka ndị ikom ahụ nọbọọ chi na Jeruselem,+ onye nke ọ bụla na onye na-ejere ya ozi, ha ga-abụkwara anyị ndị nche n’abalị na ndị ọrụ n’ehihie.”
12 Ụra+ onye na-eje ozi na-atọ ya ụtọ, n’agbanyeghị ma ọ̀ bụ ihe nta ma ọ bụ ihe ukwu ka o riri; ma ọtụtụ ihe onye ọgaranya nwere adịghị ekwe ya ka ọ rahụ ụra.