2 N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ m ka ha nọ na-achọ kwa ụbọchị. Ha na-ekwukwa na ọ na-atọ ha ụtọ ịmara ụzọ m,+ dị ka mba nke na-eme ezi omume, nke na-ahapụghịkwa ikpe ziri ezi nke Chineke ha,+ ha nọ na-arịọ m ka m kpeere ha ikpe ezi omume, na-abịarukwa Chineke nso, bụ́ onye ihe ya na-atọ ha ụtọ,+