51 Ha ga-erikwa ụmụ anụ ụlọ gị na ihe ala gị mepụtara ruo mgbe e kpochapụrụ gị,+ ha agaghịkwa ahapụrụ gị ọka,* mmanya ọhụrụ ma ọ bụ mmanụ ọ bụla, ụmụ ehi gị ma ọ bụ ụmụ ewu na atụrụ gị ọ bụla, ruo mgbe ha bibiri gị.+
17 Ha ga-erichapụ ihe unu wetara n’ubi na ihe oriri unu.+ Ha ga-eripịa ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom. Ha ga-eripịa ìgwè ewu na atụrụ unu na ìgwè ehi unu. Ha ga-eripịa osisi vaịn unu na osisi fig unu.+ Ha ga-eji mma agha bibie obodo unu dị iche iche e wusiri ike, bụ́ ndị unu tụkwasịrị obi.”