9 Ma o nyekwara ụfọdụ ndị ihe atụ a, bụ́ ndị tụkwasịrị onwe ha obi na ha bụ ndị ezi omume,+ ndị na-ewerekwa ndị ọzọ dị ka ndị na-enweghị ihe ha bụ, sị:+
11 Onye Farisii ahụ guzoro ọtọ+ wee malite ikpe ekpere+ n’obi ya, sị, ‘Chineke, ana m ekele gị na adịghị m ka ụmụ mmadụ ndị ọzọ, bụ́ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ndị ajọ omume, ndị na-akwa iko ma ọ bụ ọbụna dị ka onye ọnaụtụ a.+