9 O wee ruo n’afọ nke anọ nke ọchịchị Eze Hezekaya, ya bụ, n’afọ nke asaa nke ọchịchị Hoshia+ nwa Ila bụ́ eze Izrel, na Shalmaniza+ eze Asiria bịara ibuso Sameria agha, malite ịnọchibido ya.+
17 Jehova ga-eme ka ụbọchị a na-enwetụbeghị ụdị ya bịakwasị gị+ na ndị gị na ụlọ nna gị, bụ́ ụbọchị a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe Ifrem kewapụrụ onwe ya n’ebe Juda nọ,+ ya bụ, eze Asiria.+