5 Ugbu a, biko, ka m gwa unu ihe m ga-eme ubi vaịn m: A ga-ewepụ ogige ya,+ a ghaghịkwa ịgba ya ọkụ.+ A ga-akwatu mgbidi ya e ji nkume wuo, ọ ghaghịkwa ịghọ ebe a ga na-azọtọ azọtọ.+
6 M ga-eziga ya ka o buso mba dapụrụ n’ezi ofufe+ agha, m ga-enyekwa ya iwu ka o buso ndị m na-eweso iwe agha,+ ka ọ kwata ọtụtụ ihe, bukọrọkwa ọtụtụ ihe, meekwa ka ọ bụrụ ebe a ga na-azọtọ azọtọ dị ka ájá dị n’okporo ámá.+