63 “Ọ ga-erukwa na dị nnọọ ka Jehova nwere aṅụrị n’ihi unu imere unu ihe ọma na ime ka unu mụbaa,+ otú ahụ ka Jehova ga-enwe aṅụrị n’ihi unu ibibi unu na ịla unu n’iyi;+ a ga-efopụkwa unu n’ala ahụ ị na-aga inweta.+
23 ruo mgbe Jehova wepụrụ Izrel n’ihu ya,+ dị nnọọ ka o kwuru site n’ọnụ ndị ohu ya bụ́ ndị amụma.+ E wee si n’ala Izrel dọrọ ha n’agha laa Asiria ruo taa.+