63 “Ọ ga-erukwa na dị nnọọ ka Jehova nwere aṅụrị n’ihi unu imere unu ihe ọma na ime ka unu mụbaa,+ otú ahụ ka Jehova ga-enwe aṅụrị n’ihi unu ibibi unu na ịla unu n’iyi;+ a ga-efopụkwa unu n’ala ahụ ị na-aga inweta.+
4 Jehova wee sị ya: “Gụọ ya Jezril,+ n’ihi na n’oge na-adịghị anya, m ga-eme ka ụlọ Jihu+ zaa ajụjụ maka ọbara dum Jezril wụfuru, m ga-emekwa ka ọchịchị ụlọ Izrel kwụsị.+