11 M wee sị: “Jehova, ruo ole mgbe?”+ O wee sị: “Ruo mgbe obodo niile ghọrọ mkpọmkpọ ebe, n’enweghị onye bi ha, ruo mgbe ụlọ niile na-enweghị mmadụ nọ ha, mgbe e bibiwokwara ala a mee ka ọ tọgbọrọ n’efu;+
34 M ga-eme ka a ghara ịnụkwa mkpu ọṅụ na mkpu obi ụtọ na olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na olu nwaanyị a na-alụ ọhụrụ+ n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem; n’ihi na ala a ga-aghọ naanị ebe a lara n’iyi.’”+