9 “N’ihi na nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Lee, m ga-eme ka a ghara ịnụkwa olu aṅụrị na olu obi ụtọ, olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na olu nwaanyị a na-alụ ọhụrụ, n’ebe a, n’ihu unu nakwa n’ụbọchị unu.’+
10 M ga-eme ka a ghara ịnụkwa olu aṅụrị na olu obi ụtọ n’etiti ha+ nakwa olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na olu nwaanyị a na-alụ ọhụrụ,+ ụda nkume igwe nri,+ meekwa ka a ghara ịhụkwa ìhè oriọna.+