34 M ga-eme ka a ghara ịnụkwa mkpu ọṅụ na mkpu obi ụtọ na olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na olu nwaanyị a na-alụ ọhụrụ+ n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem; n’ihi na ala a ga-aghọ naanị ebe a lara n’iyi.’”+
9 “N’ihi na nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, ‘Lee, m ga-eme ka a ghara ịnụkwa olu aṅụrị na olu obi ụtọ, olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na olu nwaanyị a na-alụ ọhụrụ, n’ebe a, n’ihu unu nakwa n’ụbọchị unu.’+