4 N’ikpeazụ, o ruru n’afọ nke itoolu nke ọbụbụeze ya,+ n’ọnwa nke iri, n’abalị iri n’ọnwa ahụ, na Nebukadreza eze Babịlọn bịara, ya na ndị agha ya niile, ibuso Jeruselem agha,+ ha wee malite ịma ụlọikwuu ibuso ya agha na iwu mgbidi nnọchibido gburugburu ya.+