6 M ga na-ele ha anya ọma,+ m ga-emekwa ka ha lọta n’ala a.+ M ga-ewu ha dị ka ụlọ, agaghị m akwatu ha; m ga-akụ ha dị ka osisi, agaghịkwa m efopụ ha.+
28 “Ọ ga-erukwa na dị nnọọ ka m mụ anya n’ebe ha nọ+ ifopụ ha, kwatuo ha, tida ha, laa ha n’iyi, bibiekwa ha,+ otú ahụ ka m ga-amụ anya n’ebe ha nọ iwulite ha, kụọkwa ha dị ka mkpụrụ,”+ ka Jehova kwuru.