26 M ga-emekwa ka i nwee ndị ikpe dị ka i nwere na mbụ, meekwa ka i nwee ndị ndụmọdụ dị ka i nwere ná mmalite.+ E mesịa, a ga na-akpọ gị Obodo Ezi Omume, Obodo Kwesịrị Ntụkwasị Obi.+
6 M ga na-ele ha anya ọma,+ m ga-emekwa ka ha lọta n’ala a.+ M ga-ewu ha dị ka ụlọ, agaghị m akwatu ha; m ga-akụ ha dị ka osisi, agaghịkwa m efopụ ha.+
6 M ga-eme ka ụlọ Juda dị elu, m ga-azọpụtakwa ụlọ Josef.+ M ga-enye ha ebe obibi, n’ihi na m ga-emere ha ebere;+ ha ga-adị ka ndị m na-ajụghị ajụ;+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke ha, m ga-anụkwa olu ha.+