18 N’oge ahụ, ụlọ Juda na ụlọ Izrel+ ga-ejekọ+ ije, ha niile ga-esoro si n’ala dị n’ebe ugwu pụta wee banye n’ala m nyere nna nna unu hà ka ọ bụrụ ihe nketa ha.+
16 “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, were osisi,+ deekwa n’elu ya, ‘Nke Juda na ụmụ Izrel bụ́ ndị òtù ya.’+ Werekwa osisi ọzọ, dee n’elu ya, ‘Nke Josef, ya bụ, osisi Ifrem,+ na ụlọ Izrel dum bụ́ ndị òtù ya.’+
10 “Ụmụ Izrel ga-adị ka ájá dị n’oké osimiri, bụ́ nke a na-apụghị ịtụ atụ̀ ma ọ bụ ịgụta ọnụ.+ Ọ ga-erukwa na n’ebe a na-asịbu ha, ‘Unu abụghị ndị m,’+ a ga-asị ha, ‘Unu bụ ụmụ nke Chineke dị ndụ.’+