Zekaraya
10 “Rịọnụ Jehova ka o mee ka mmiri zoo+ n’oge ụla mmiri,+ rịọnụ Jehova bụ́ onye na-eme ka mmiri ruo n’ígwé ojii,+ onye na-eme ka mmiri zooro ndị mmadụ,+ zooro ahịhịa ndụ ọ bụla dị n’ubi.+ 2 N’ihi na terafim+ ekwuwo okwu anwansi; ndị na-agba afa ahụwo ọhụụ ụgha,+ ọ bụ nrọ na-abaghị uru ka ha na-akọ, ọ bụkwa n’efu ka ha na-agbalị inye nkasi obi.+ Ọ bụ ya mere ha ga-eji nukọrọ pụọ dị ka ìgwè atụrụ;+ ha ga-enwe mmekpa ahụ́, n’ihi na e nweghị onye ọzụzụ atụrụ.+
3 “M na-eweso ndị ọzụzụ atụrụ iwe dị ọkụ,+ m ga-emekwa ka ndị ndú na-akpọ ekwo nkụ dị ka ewu+ zaa ajụjụ;+ n’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha echewo ihu ya n’ebe ìgwè atụrụ ya,+ bụ́ ụlọ Juda, nọ, o mewokwa ka ha dị ka ịnyịnya+ ya nke dị ebube n’agha. 4 Onyeisi+ ga-esi n’ime ya pụta, onye ọchịchị a ga na-adabere na ya+ ga-esi n’ime ya pụta, ụta agha+ ga-esi n’ime ya pụta; onye ọ bụla bụ́ onyeisi ọrụ+ ga-esi n’ime ya pụta, ha niile. 5 Ha ga-adịkwa ka ndị dike+ bụ́ ndị na-azọ ụkwụ n’apịtị dị n’okporo ámá ka ha na-alụ agha.+ Ha ga-alụ agha, n’ihi na Jehova nọnyeere ha;+ ihere ga-emekwa ndị na-agba ịnyịnya.+ 6 M ga-eme ka ụlọ Juda dị elu, m ga-azọpụtakwa ụlọ Josef.+ M ga-enye ha ebe obibi, n’ihi na m ga-emere ha ebere;+ ha ga-adị ka ndị m na-ajụghị ajụ;+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke ha, m ga-anụkwa olu ha.+ 7 Ndị Ifrem ga-adị nnọọ ka dike,+ obi ha ga-aṅụrị ọṅụ dị ka ọ bụ n’ihi mmanya.+ Ụmụ ha ga-ahụ ya wee ṅụrịa ọṅụ;+ obi ha ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova.+
8 “‘M ga-afụrụ ha mkpọrọhịhị+ wee chịkọta ha; n’ihi na m ga-agbapụta ha,+ ha ga-adị ọtụtụ, dị ka ndị dị ọtụtụ n’oge gara aga.+ 9 M ga-aghasasị ha dị ka mkpụrụ n’etiti ndị dị iche iche,+ ha ga-anọkwa n’ebe ndị dị anya cheta m;+ a ga-atụte ha na ụmụ ha, ha ewee lọta.+ 10 M ga-esi n’ala Ijipt kpọlata ha;+ m ga-esikwa n’Asiria kpọkọta ha;+ m ga-akpọta ha n’ala Gilied+ nakwa na Lebanọn, ọ gaghịkwa aba ha.+ 11 M ga-agafere n’oké osimiri wee kpatara mmiri ya nsogbu;+ m ga-etida ebili mmiri nke oké osimiri,+ ogbu mmiri niile nke Naịl ga-ata.+ M ga-eweda ihe Asiria ji anya isi ala,+ mkpanaka+ Ijipt agaghị adịkwa.+ 12 Mụ onwe m bụ́ Jehova ga-eme ka ha dị elu,+ ha ga-ejegharịkwa n’aha m,’+ ka Jehova kwuru.”