10 Mkpanaka eze agaghị esi na Juda pụọ,+ mkpara onye na-achị isi agaghịkwa esi n’agbata ụkwụ ya pụọ, ruo mgbe Shaịlo bịara;+ ọ bụkwa ya ka ndị dị iche iche ga-erubere isi.+
8 Jehova bụ́ Chineke anyị, i meworo anyị amara+ nwa mgbe nta site n’ime ka anyị nwee ndị fọdụrụ ndụ+ nakwa site n’inye anyị mkpọ́ n’ebe nsọ gị, Chineke anyị, i mewo ka anya anyị gbukepụ,+ meekwa ka anyị nwetatụ ume n’agbụ anyị nọ na ya.+