16 “M ga-achọ nke furu efu,+ ọ bụkwa nke a chụfuru achụfu ka m ga-edughachite. M ga-eke ọkpụkpụ gbajiri agbaji ákwà, meekwa ka nke ahụ́ na-adịghị ike dịrị ike. Ma, m ga-ala nke mara abụba+ na nke dị ike n’iyi. M ga-eji ikpe nyejuo ya afọ.”+
17 “‘Ma unu onwe unu bụ́ atụrụ m, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee, m ga-ekpe ikpe n’etiti otu atụrụ na ibe ya, n’etiti ebule na mkpi.+