6 Jehova nwere mma agha. Ọ ga-ejupụta n’ọbara.+ A ga-eme ka o jupụta n’abụba, jupụtakwa n’ọbara ụmụ ebule na mkpi, na abụba+ si n’akụrụ ebule. N’ihi na Jehova nwere àjà ọ kwadebere na Bọzra, ọ ga-asụkwa ndị mmadụ akwụ n’ala Idọm.+
3 “M na-eweso ndị ọzụzụ atụrụ iwe dị ọkụ,+ m ga-emekwa ka ndị ndú na-akpọ ekwo nkụ dị ka ewu+ zaa ajụjụ;+ n’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha echewo ihu ya n’ebe ìgwè atụrụ ya,+ bụ́ ụlọ Juda, nọ, o mewokwa ka ha dị ka ịnyịnya+ ya nke dị ebube n’agha.