63 “Ọ ga-erukwa na dị nnọọ ka Jehova nwere aṅụrị n’ihi unu imere unu ihe ọma na ime ka unu mụbaa,+ otú ahụ ka Jehova ga-enwe aṅụrị n’ihi unu ibibi unu na ịla unu n’iyi;+ a ga-efopụkwa unu n’ala ahụ ị na-aga inweta.+
29 Mgbe mmadụ biliri ịchụ gị ọsọ na ịchọ mkpụrụ obi gị, a ga-ekechi mkpụrụ obi onyenwe m n’akpa ndụ+ nke dị n’aka Jehova bụ́ Chineke gị;+ ma ọ ga-agbapụ mkpụrụ obi ndị iro gị dị ka à ga-asị na e si n’èbè gbapụ ya.+
13 M ga-esi n’ala a tụga unu n’ala unu na-amaghị,+ nke nna unu hà na-amaghịkwa,+ n’ebe ahụ ka unu ga-efe chi ọzọ dị iche iche+ ehihie na abalị, n’ihi na agaghị m emere unu amara.”’