Ezra 9:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Jehova bụ́ Chineke anyị, i meworo anyị amara+ nwa mgbe nta site n’ime ka anyị nwee ndị fọdụrụ ndụ+ nakwa site n’inye anyị mkpọ́ n’ebe nsọ gị, Chineke anyị, i mewo ka anya anyị gbukepụ,+ meekwa ka anyị nwetatụ ume n’agbụ anyị nọ na ya.+ Abụ Ọma 77:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Obiọma* ya ọ̀ kwụsịwo ruo mgbe ebighị ebi?+Okwu ya ọ̀ ghọọla ihe efu+ site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ? Abụ Ọma 106:45 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 45 N’ihi ha, ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya,+Ọ na-agbanwe obi ya dị ka oké obiọma ya si dị ukwuu.+ Malakaị 3:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 “N’ihi na abụ m Jehova; adịghị m agbanwe agbanwe.+ Unu onwe unu bụ ụmụ Jekọb; unu anwụchabeghị.+
8 Jehova bụ́ Chineke anyị, i meworo anyị amara+ nwa mgbe nta site n’ime ka anyị nwee ndị fọdụrụ ndụ+ nakwa site n’inye anyị mkpọ́ n’ebe nsọ gị, Chineke anyị, i mewo ka anya anyị gbukepụ,+ meekwa ka anyị nwetatụ ume n’agbụ anyị nọ na ya.+