7 “M wee kpọbata unu n’ala e nwere ubi mkpụrụ osisi, ka unu rie ihe o mepụtara na ihe ọma ndị dị na ya.+ Ma unu batara merụọ ala m; unu mekwara ka ihe nketa m bụrụ ihe arụ.+
18 Ma, m ga-ebu ụzọ kwụzuo ha ụgwọ njehie ha+ na ụgwọ mmehie ha, n’ihi na ha merụrụ ala m.+ Ha emewo ka ozu ihe arụ ha na nke ihe ha jọgburu onwe ha jupụta n’ihe nketa m.’”+