24 “‘Unu emela onwe unu ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha site na nke ọ bụla n’ime ihe ndị a, n’ihi na ọ bụ ihe ndị a niile ka mba ndị m na-achụpụ n’ihu unu ji mee onwe ha ka ha bụrụ ndị na-adịghị ọcha.+
33 “‘Unu emerụla ala unu bi; n’ihi na ọ bụ ọbara na-emerụ ala,+ ọ dịghịkwa ihe e ji ekpuchiri ala mmehie maka ọbara a wụfuru na ya, ma e wezụga ọbara nke onye wụfuru ọbara.+
23 ozu ya agaghị adị n’elu osisi abalị dum;+ kama ị ga-ahụ na e liri ya n’ụbọchị ahụ, n’ihi na ihe a bụrụ ọnụ n’ebe Chineke nọ ka onye a kwụwara n’osisi bụ;+ emerụkwala ala gị, nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị ka ọ bụrụ ihe nketa gị.+
18 Ma, m ga-ebu ụzọ kwụzuo ha ụgwọ njehie ha+ na ụgwọ mmehie ha, n’ihi na ha merụrụ ala m.+ Ha emewo ka ozu ihe arụ ha na nke ihe ha jọgburu onwe ha jupụta n’ihe nketa m.’”+