21 “N’ihi na nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Otú ahụkwa ka ọ ga-adị mgbe m ga-eweta ihe anọ dị oké egwu m ga-eji kpee ikpe,+ mma agha na ụnwụ na ajọ anụ ọhịa na ọrịa na-efe efe,+ bụ́ ndị m ga-eme ka ha bịakwasị Jeruselem iji bipụ mmadụ na anụ ụlọ nọ n’ime ya.+