Ọpụpụ 9:22 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 22 Jehova wee gwa Mozis, sị: “Setịa aka+ gị chee n’eluigwe, ka akụ́ mmiri ígwé+ wee daa n’ala Ijipt dum, dakwasị mmadụ na anụ ọhịa na ahịhịa ndụ niile nke ubi n’ala Ijipt.” Joshụa 10:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 O wee ruo na ka ha si n’ihu Izrel na-agba ọsọ ma nọrọ ná mkpọda obodo Bet-horọn, Jehova mere ka nnukwu akụ́ mmiri ígwé+ si n’eluigwe na-adagbu ha ruo Azika. Ndị akụ́ mmiri ígwé ahụ gburu dị ọtụtụ karịa ndị ụmụ Izrel ji mma agha gbuo. Abụ Ọma 18:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 Ígwé ojii ya sikwa n’ìhè dị n’ihu ya gafere,+Akụ́ mmiri ígwé na icheku ọkụ sikwa n’ígwé ojii zoo.+
22 Jehova wee gwa Mozis, sị: “Setịa aka+ gị chee n’eluigwe, ka akụ́ mmiri ígwé+ wee daa n’ala Ijipt dum, dakwasị mmadụ na anụ ọhịa na ahịhịa ndụ niile nke ubi n’ala Ijipt.”
11 O wee ruo na ka ha si n’ihu Izrel na-agba ọsọ ma nọrọ ná mkpọda obodo Bet-horọn, Jehova mere ka nnukwu akụ́ mmiri ígwé+ si n’eluigwe na-adagbu ha ruo Azika. Ndị akụ́ mmiri ígwé ahụ gburu dị ọtụtụ karịa ndị ụmụ Izrel ji mma agha gbuo.
12 Ígwé ojii ya sikwa n’ìhè dị n’ihu ya gafere,+Akụ́ mmiri ígwé na icheku ọkụ sikwa n’ígwé ojii zoo.+